SECTION 33: Ikike Idi Ndu (Onweghi onye ndu gi di n’aka ya)
- Ndu gi adighi n’aka onye obuna.
- O bu ida nnukwu iwu mmadu obuna inapu gi ndu gi n’ike.
- O bu orubere gi idi ndu ma n’eku ume n’ime uwaa.
- O bu nani ebe iwu kwadoro ka e nwere ike igbu mmadu n’ike.
SECTION 34: Nsọpụrụ na nkwanyere ùgwù nke onwe mmadụ (Mmadụ abụghị anụ ọhịa)
- Mmadụ e kwesịghị ka a kpaso ya agwa dịka anụ ọhị Ùgwù na nsọpụrụ bụ orubere dịrị gị mgbe nile.
- Mmadụ e nweghị ike inye gị ntaram ahụhụ na ụdị ọbụ
- O nweghị onye pụrụ ime gị ohu ma ọ bụ manye gị ịgbara ya odibo.
- I nwere ike ịrụ ọrụ ike ma o buru na ị banye ọrụ ndị agha, ọrụ uwe ojii ma ọ bụ otú NYSC .Ụlọ ikpe nwere ike inye iwu ka a manye gị ịrụ ọrụ
SECTION 35: Orubere nke nwere onwe gi ( i nwere ohere ibi ndu gi ka o siri soo gi)
- I nwere ohere ibi ndu gi ka o siri masi gi n’enweghi mgbochi nke onye obuna.
- O bu nani ulo ikpe puru inye ntuziaka iji were gbochi gi igaghari ma obu i nwere onwe gi. Ulo ikpe puru ime nkea ma o buru na i dara iwu, o buru na i choghi ibia ulo ikpe ma o bu imejuputa ntuziaka ulo ikpe nyere gi, o buru na inwere oria na efe-efe dika oria Ebola , o buru na irubeghi afo iri na asato, o buru na isi mgbaka na eme gi, o buru na i na-anu ogwu ike. Goomenti puru igbochi ikike onye di etua nwere banyere onwe ya na igaghari ka o siri masi ya.
- Onye a na-ekpe ikpe e kwesighi i no n’ulo mkporo karia afo onee okwesiri ije nga banyere iwu ahu o dara (Onye zuru oshi efi kwesiri ije nga afo abuo. E kwesiri itoghapu onye di etua site na ulo mkporo ma o buru na afo abuo agachaa ma ya bu ikpe ka na-aga n’ihu).
- Onye o buna ndi uwe ojii jidere nwere ike iju nay a agaghi ekwu ihe obuna ganye na ya ahu onye oka-iwu ya ma o bu onye obuna masiri ya.
- Mgbe obuna ndi uwe ojii ma obu onye obuna jidere gi, ha kwesiri ideputa ma kowari gi n’asusu i na anu nke oma, ya bu iwu i dara. Ha kwesiri ime nkea n’ime otu ubochi ha jiri were jide gi.
- O buru na iwu a na-ebo gi ebubo abughi nke ntaram-ahuhu ya bu amam-ikpe onwu, e kwesiri i duga gi ulo ikpe tupu otu ubochi agafee e jiri were jide gi. O buru na e nweghi ulo ikpe di nso dika kilometa iri ano, e nwere ike ijide onye di etua nani ubochi abuo ma obu onuogu ubochi onee kwesiri ekwesi tupu eduga ya ulo ikpe.
- O buru na ejidere gi n’ihi ihe i na emeghi, ma o bun a e jidere gi n’uzo na ezighi-ezi, e kwesiri inye gi ihe iti-aka n’obi zuru oke. E kwesirikwara ka ya bu onye jidere gi ma obu ulo oru ndi uwe ojii irio gi mgbaghara n’iru ndi mmadu dika o siri kwesi ekwesi.
SECTION 36: Ikpe nkwumoto na ohere izara onu gi: (ikpe-chakwaa ka m kpee! A pụghị igochi gị ọnụ)
- Ọ bụ orubere gị ị zara ọnụ gị na ebubo ọbụ
- Aka gị dị ọcha na ebubo ọbụna ganye na ụlọ ikpe ekpebie na ị dara iwu.
- O bụ ọrụ dịịrị onye na ebo gị ebubo na ị dara iwu igosi ka i siri daa ya bụ ọ bụghị ọrụ dịrị gị ị gosi na aka gị dị ọcha, belu sọ nanị ebe iwu kwuru etua.
- E Kwesịrị ka usoro ụlọ ikpe ọbụna ma ọ bụ mkpebi ụlọ ikpe ọbụna gbasara orubere dịrị mmadụ, bụrụ nke e mere n’irụ mmadụ E kwesighi ikpe gị ikpe nzuzo ma ọ bụ nye gị mkpebi muchi-muchi.
- Onye ọbụna e boro ebubo na ọ dara iwu kwesịrị ka ụlọ ikpe mee ngwangwa ma nye ya ikpe kwụrụ ọtọ na-egbụghị nnukwu oge.
- Ụlọ ikpe nwere ikike ịchụpụ mmadụ ọbụna n’ime ụlọ Ụlọ ikpe nwekwara ikike inye ntụziaka ka ọ bụrụ nanị ndị nwe ikpe ya na ndị ọka-iwu ha ka a chọrọ ka ha nọrọ mgbe ikpe na-aga n’ihu. Ụlọ ikpe pụrụ ime nkea ma ochee na ikpe dị etua n’iru ọha pụrụ ịmetụta orubere na ọdịmma nke onye a na-ekpe ikpe. o nwekwara ike ị bụ maka ọdịmma nke obodo ma ọ bụ nchekwaba nke dị mmadụ. Ụlọ ikpe nwekwara ike inye ntụziaka dị etua ma ọ bụrụ na ndị nwe ikpe erubeghị afọ iri na asatọ.
- Onye ọbụna a na-ebo ebubo na ọ dara iwu bụ onye nke e kwesịrị i were ka onye aka ya dị ọcha ganye na ụlọ ikpe e kpebie na ọ dara ya bụ Nke pụtara na ọ bụ nanị mgbe ụlọ ikpe kwuputara na mmadụ dara iwu n’ezie ka a pụrụ iwere onye dị etua dịka onye dara iwu.
- Onye a na-ebo ebubo kwesịrị ka e jiri asụsụ ọ na-aghọta nke ọma ma kọwara ya ihe nile gbasara ya bụ iwu a na-ebo ya ebubo na ọ
- Onye a na-ebo ebubo na ọ dara iwu kwesịrị ka e nye ya ohere zuru okè ya na ihe ọbụna nke ga e nyere ya aka ịkwado maka ịmara ọnụ ya n’ulo ikpe.
- Onye a na-ebo ebubo na ọ dara iwu pụrụ ịzara ọnụ ya n’onwe ya n’ulo ikpe ma ọ bụ site na enyemaka nke ọka-iwu o jiri aka ya dị họ
- Onye a na-ebo ebubo na ọ dara iwu pụrụ n’onwe ya, ị gba ndị akaebe n’ụlọ ikpe ajụjụ ọnụ. ọ nwekwara ike ime nkea site na enyemaka onye ọka-iwu ya. o nwekwara ike ịkpọ onye ọbụna ka ọ bịa ụlọ ikpe maka ịgba akaebe. Ndị akaebe dị etua nwere ike bụrụ ndị nke ya ma ọ bụ ndị nke na-ekpe ya ikpe.
- Onye a na-ebo ebubo na ọ dara iwu kwesịrị ka enye ya onye ntapi-okwu iji mee ka ọ ghọta nke ọma asụsụ e ji ekpe ya ikpe. Ọ kwesịghị ịkwụ ụgwọ ọbụna maka nkea
- Ụlọ ikpe ọbụna kwesịrị idetu n’akwụkwọ ihe nile gbasara ka e siri kpee ikpe banyere onye a na-ebo ebubo na ọ dara iwu. Ya bụ onye e kpere ikpea nwere ikike ị nweta akwụkwọ ndị ahụ site n’aka ụlọ o kwesịrị ime nkea n’ime ụbọchị asaa e jiri kpebie ya bụ ikpe.
- E kwesịghị ịma mmadụ ikpe gbasara ihe ọbụna nke abụghị iwu n’oge o jiri mee ya bụ ihe ( dika na-afo 2015, ichighari ewu, aturu ma o bu efi abughi iwu. Mana site na afo 2017, ime nkea bu ida iwu na ufodu Steeti na Nigeria). Ya bu enweghi ike ikpe oney mere nkeahu na afo 2015 ikpe n’ime afo 2017. E nweghịkwa ike inye mmadụ ntaram-ahụhụ karịa nke na-eso iwu ọ dara, n’oge o jiri were daa ya bụ Nkea pụtara na ọ bụghị mmadụ mee ihe taata nke na-abụghị iwu, o ruo echi, e jee mepụta iwu ma ọ bụ ntaram-ahụhụ ma were ya kpee onye dị etua ikpe maka ihe ahụ o mere mgbe gara aga. (i ma atu, na afo 2013 ntaram ahuhu diri onye nto bu ije ulo mkporo afo ise mana edeghariri ya bu iwu na afo 2017 ka o buru ije nga mkpuru oka)
- Onye ọbụna nke gosiri na e kpebugo ya ikpe na mbụ gbasara ebubo na ọ dara iwu, onye dị etua e kwesịghị ka e kpekwaa ya ikpe ọzọ n’ọdịnihu gbasara ya bụ Nkea ga-adị irè ma ọ bụrụ na ụlọ ikpe enwego mkpebi ikpeazụ gbasara ya bụ ebubo na mbụ. Mkpebi ahụ nwere ike bụrụ ọmụma ikpe ma ọ bụ nke ntọhapụ onye dị etua.
- E nweghịkwa ike ikpeghari mmadụ ikpe ọzọ ma ọ bụrụ na a gbághàrágo ya iwu ahụ ọ dara na mbụ.
- E nweghị ike ịmanye onye a na-ebo ebubo na ọ dara iwu ka ọ bịa gbaa akaebe banyere ikpe a na-ekpe ya.
- E nweghị ike ịma mmadụ ikpe ma ọ bụrụ na o nweghị ebe iwu nke obodo Naijiria, ma ọ bụ nke Steeti depụtara n’akwụkwọ na ihe onye ahụ mere dara iwu. E kwesịrị ị depụta ihe ọbụna bụ iwu n’akwụkwọ ya na ntaramahụhụ na-eso ya, tupu e nwee ike ịma mmadụ ikpe banyere nke ahụ.
SECTION 37: Ikike banyere nzochi nke ndu mmadu ya na ezi n’ulo ya (O nweghi onye puru igba ihe gbasara gi ma o bu ezi n’ulo gi n’anwu)
- O nweghi onye puru igba ihe gbasara gi na ezi n’ulo gi n’anwu ma o buru na inyeghi ikike banyere nkea.
- Ihe gbasara ulo gi, igwe okwu gi, ederede nke leta na ihe ndi ozo bu nke e kwesiri izochiri go ma chekwaba ha nke oma.
- (Onye gi na ya bi n’ogbe apughi iwere ihe o nuru gi na nwunye gi n’ekwu n’ulo unu jee gbasaa na igwe okwu redio).
SECTION 38: Ikike banyere echiche, okwukwe na ekpem-ekpe ụka (o nweghị onye ụka gị, okwukwe na echiche obi gị gbasara)
- I nwere ike iche ụdị echiche ọbụna masịrị gị. Ọ nweghị onye echiche obi gị nke abughi ihe ojoo gbasara.
- Ụlọ akwụkwọ gị e nweghị ikike ị ma nye gị ka ịhapụ ụka gị ma ọ bụ ka ị soro ụka ndị ọzọ.
- O nweghị onye pụrụ ị manye gị ka ị mụọ akwụkwọ banyere ụka abụghị nke gi.
- Kama ị banye ma ọ bụ inwe nzukọ otú nzuzo bụ nnukwu ịda-iwu na Naijiria.
- O nweghị onye pụrụ igbochi gi ịhọrọ ma ọ bụ ịgbanwe okwukwe, uka na echiche obi gi ka o siri sọọ
SECTION 39: Orubere diri onye ikwu uche ya (Kwuo ka o siri masi gi)
- I nwere ike ikwu uche gi mgbe nile.
- Mmadu e kwesighi ijide gi n’onu ikwu okwu.
- I kwesiri itunyere mmadu alo ma obu gwa ya etu ihe siri di gi n’obi n’enweghi mgbochi obuna.
- I puru iguzobe igwe mgbasa ozi redio ma o bu nke ihe onyonyo TV na Newzpepa ma o buru na goomenti nye gi akwukwo ikike ime nkea.
- I nwere ohere inwe usoro nzikorita ozi nke intaneti obuna masiri gi.
- Mana o nwere ebe iwu gbochibidoro ndi oru oyibo, oru dokinta ma o bu oru ulo ikpe igbasa ozi ha natara na nzuzo. Nkea bu n’ihi udi okwa ha ji.
SECTION 40: Orubere nke nmekọrịta na ịgba izu (nmeko gị na mmadụ ibe gị abụghị ihe ọjọọ)
- I nwere ike ịkpọ izuzu ma ọ bụ nwee nzukọ gị na mmadụ ibe gị.
- Ị nwere ike isonyere n’otú ma ọ bụ kpọọ nzukọ gbasara ọdịmma gị na ebum-n’obi gi.
- I nwekwara ohere ịpụta ma ọ bụ ịhọrọ ụdị otú ọbụna dịka ị sịrị chọọ.
- I nwere ike isonyere ma ọ bụ ibido otú ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụna masịrị gị. Mana ihe ọbụna gbasara nchịkwa otú ndọrọndọrọ ọchịchị dị n’aka Independent National Electoral Commission (INEC).
SECTION 41: Orubere i nwere maka ngaghari (O nweghi onye puru igbochi gi igaghari ebe obuna i choro)
- Nwa afo Naijiria obuna puru ije ebe nile o choro n’ime obodoa n’enweghi mgbochi obuna.
- Nwa afo Naijiria obuna puru ibi na akuku obodo Naijiria obuna di ya mma n’enweghi mgbochi obuna.
- Oso ya buru ugwu-awusa ma obu odida anyanwu nke obodoa.
- E nweghi ike igbochi nwa afo obodoa ije ebe obuna, ihapu Naijiria ma o bu ibata Naijiria. Onweghikwa onye puru ichupu gin a Naijiria.
- Kama o buru na mmadu dara iwu, e nwere ike igbochi ya igbapu oso gawa obodo ozo. Naijiria nwekwara ike idunye obodo ozo nwa afo obuna nke dara iwu ebe di etua ma gbalata obodoa.
SECTION 42: Nmegide, nmenyere na ịkpa oke (E mee nwata ka e mere ibe ya, obi adi ya mma)
- O nweghị onye pụrụ imegide gị n’ihi agbụrụ i si, n’ihi okwukwe gị ma ọ bụ maka na ị bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.
- O nweghị onye pụrụ igbochi gị ị nweta ihe i kwuru kwesịrị dịka ndị ọzọ na n’ihi ebe ísì, etu e si mụọ gị, ya na n’ihi ihe ndị ahụ gbasara gi.
- Nanị na usoro ịhọpụta ọkwá gọọmenti, nke ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị agha ka e nwere ike ime ịkpa oke dị etu a dịka iwu sịrị
SECTION 43: Orubere gi inwta aku na uba ebe obuna na Naijiria (I nwere ike igota ulo, ala, ugbo ala ebe obuna i choro na Naijiria)
- Nwa afo Naijiria obuna puru izuta ma o bu inweta aku na uba di iche iche na ebe obuna masiri ya na ala Naijiria. (Onye Hausa puru inwe ulo na Onitsha, Nwanyi Igbo si owerri nwere ike izuta ala na Sokoto, Onye Yoruba nwekwara ike si Lagos nwekara ike ije na Kaduna zuta ulo.)
SECTION 44: I napụta mmadụ akụ na ụba n’ike (E kwesiri inye gi ihe iti-aka n’obi)
- I nwere ike inwe aku na uba ebe obuna i choro na Naijiria na-agbanyeghi obdodo i si na Naijiria.
- O nweghị onye pụrụ iji anya ọkụ napụ gị akụ na ụba i nwere na ebe ọbụna na Naijiria.
- Ọ bụrụ na emee nkea n’ihi iwu e mebere, I kwesịrị ị nweta ego ma ọ bụ ihe iti-aka n’obi nke zuru okè natufughi oge. I nwere ike ikwu ihe iti-áká n’obi nke i chere na ọ ga-adị gị
- Akụ na ụba nile si na chi, ndị nke nnọ n’ime ala, ime mmiri ma ọ bụ n’elu ala Naịjirịa bụ nke gọọ Ihe dika mmanu ugbo-ala, Koolu, Diamond na gassi.
- Mana ọ nwere ébé iwu ma ọ bụ gọọmenti nwere ikike ịnapụta gị akụ na ụba gị n’ike.
SECTION 45: Mgbochi banyere orubere diri mmadu ndia (O nwere ebe ndi goomenti puru igbochi orubere diri gi)
- O bu nani ebe goomenti nwere ezigbo ebum n’obi banyere nchekwa ndu na ikike ndi mmadu, nchekwa ugwu na odimma nke ora nile ka o puru inye ntuziaka nke nwere ike imetutua orubere diri mmadu dika: orubere nzochi nke gin a ezi n’ulo gi, orubere diri gi ikpe uka obuna, orubere igaghari ebe obuna ichoro, orubere nmekorita mmadu na ibe ya na orubere onye kwuo uche ya.
- Goomenti ga-egosiriri na o bu n’ihi odimma nke obodo Naijiria na ndu ndi nno n’ime ya ka o puru iji mee nkea.
- Abia na oge ihe mberede di egwu dika agha ma o bu ogba-aghara, Onye isi ala Naijria, site na nkwado nke ndi omebe iwu ala anyia puru iti iwu ka ewezuga orubere ndia ahu gbasara nwereonye na ngaghari nke nwa afo obodoa.
- Onweghi onye nwere ike iwere ndu mmadu n’ike nani ma obu onye nwuru n’ihi inu agha.
- O nweghikwa ikike mmadu nwere ima mmadu ikpe ma o buru na ihe o mere abughi ida iwu n’oge o jiri were mee ya bu ihe. Onweghikwa onye a puru inye ntaram-ahuhu kariri nke na ezote iwu nke o dara.
- Onweghi iwu obuna puru inapu mmadu orubere ndia ahu.
SECTION 46: Ulo ikpe nwere ikike maka orubere mmadu (E kwesiri m igba akwukwo gbasara orubere m mgbe obuna. Kedu ulo ikpe m ga-eje?)
- Jee n’ụlọ ikpe gbaa akwụkwọ mgbe ọbụna i chere na mmadụ megidere ma ọ bụ na-achọ imegide orubere gị ndị dị n’ime ngalaba akwụkwọ iwua bu sekshon iri ato na ato rue Sekshon iri ato na isii.
- Ọ bụ n’ụlọ ikpe dị enu nke Steeti bụ High Court ka ị pụrụ ije gbaa akwụkwọ banyere udi mkpesa di etua.
- Nnukwu ọka-ikpe obodoa bụ Chief Justice nke Naijiria ka ọ dịrị ịmepụta iwu nke ụlọ ikpe High Court kwesịrị ịgbaso maka ikpe-ikpe banyere orubere dịrị mmadụ.
- I nwekwara ike inweta enyemaka ego ma ọ bụ nke onye ọka-iwu dịka iwu sịrị kwuo banyere ikpe dị