Section 33 Ikike Idi Ndu (Onweghi onye ndu gi di n’aka ya)
Section 34 Nsọpụrụ na nkwanyere ùgwù nke onwe mmadụ (Mmadụ abụghị anụ ọhịa)
Section 35 Orubere nke nwere onwe gi ( i nwere ohere ibi ndu gi  ka o siri soo gi)
Section 36 Ikpe nkwumoto na ohere izara onu gi: (ikpe-chakwaa ka m kpee apụghị igochi gị ọnụ)
Section 37 Ikike banyere nzochi nke ndu mmadu ya na ezi n’ulo ya (O nweghi onye puru igba ihe gbasara gi ma o bu ezi n’ulo gi n’anwu)
Section 38 Ikike banyere echiche, okwukwe na ekpe-ekpe ụka (o nweghị onye ụka gị, okwukwe na echiche obi gị gbasara)
Section 39 Orubere diri onye ikwu uche ya (Kwuo ka o siri masi gi)
Section 40 Orubere nke nmekọrịta na ịgba izu (nmeko gị na mmadụ ibe gị abụghị ihe ọjọọ)
Section 41 Orubere i nwere maka ngaghari (O nweghi onye puru igbochi gi igaghari ebe obuna i choro)
Section 42 Nmegide, nmenyere na ịkpa oke (E mee nwata ka e mere ibe ya, obi adi ya mma)
Section 43 Orubere gi inwta aku na uba ebe obuna na Naijiria (I nwere ike igota ulo, ala, ugbo ala ebe obuna i choro na Naijiria)
Section 44 I napụta mmadụ akụ na ụba n’ike (E kwesiri inye gi ihe iti-aka n’obi)
Section 45 Mgbochi banyere orubere diri mmadu ndia (O nwere ebe ndi goomenti puru igbochi orubere diri gi)
Section 46 Ulo ikpe nwere ikike maka orubere mmadu (E kwesiri m igba akwukwo gbasara orubere m mgbe obuna. Kedu ulo ikpe m ga-eje?)